Menu

Abụ Ọma 13

BIB

1 Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị? 2 Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m? 3 Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ; 4 mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ. 5 Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị. 6 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.

Everything we make is available for free because of a generous community of supporters.

Donate