Menu

Abụ Ọma 54

BIB

1 O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m. 2 O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m. 3 Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela 4 Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume. 5 Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi. 6 Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma. 7 Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.

Everything we make is available for free because of a generous community of supporters.

Donate